Judges 3

1Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan. 2O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga. 3Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat. 4A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.

5Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus. 6Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe.

Otniel, onye ikpe

7Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe. 8Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ. 9Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha. 10Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya. 11Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.

Ehud

12Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab. 13Ọ kpọtara ndị Amọn
Ndị Amọn bụ ndị si nʼagbụrụ Lọt, nke a dị nʼakwụkwọ Jen 19:38, ebe ndị Amalek si nʼagbụrụ Ịsọ (ị ga-agụta nke a nʼakwụkwọ Jen 36:12,16). Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị agbataobi ndị Izrel, ma ha bụ ndị iro ka ndị iro niile nke ndị Izrel nwere (gụọ Dit 25:17-18).
na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.
14Afọ iri na asatọ site nʼoge ahụ ka ụmụ Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị Eglọn, eze Moab.

15Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ. 16Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya. 17O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu. 18Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ. 19Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.”

Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.

20Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ, 21Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ. 22Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya. 23Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.

24Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.” 25Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.

26Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira. 27Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.

28Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee. 29Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ. 30Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.

Shamga

31Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.

Copyright information for IboBIU